18nʼihi na i nwere ọtụtụ ihe ọma nʼihu gị. Olileanya dị ukwuu dịrị gị.
19Nwa m, nwee uche, gbasookwa ụzọ Chineke.
20Anọla nʼetiti ndị na-aṅụbiga mmanya oke, na ndị iri oke oriri na-atọ ụtọ,
21nʼihi na ihe niile ga-akọ ha. Ọ bụkwa nkịrịnka akwa ka onye oke ụra na-eyi nʼahụ.
22Ṅaa ntị nʼịdọ aka na ntị nna gị, akpọkwala ịdọ aka na ntị nne gị bụ agadi nwanyị asị.