28Dịka onye ohi ka ọ na-echere na-emekwa ka ndị na-ekwesighị ntụkwasị obi baa ụba nʼetiti ụmụ nwoke.
29Onye ka obi ya jupụtara nʼahụhụ? Onye nọ na iru ụjụ? Olee onye nwere esemokwu? Onye nwere ọtụtụ ihe mkpesa? Onye nwere mmerụ ahụ nke na-abaghị uru? Onye nwere anya nke na-acha ọbara ọbara?
30Ọ bụ ndị na-anọ ogologo oge na-aṅụ mmanya, onye na-aga ịchọpụta mmanya agwara agwa.
31Elekwasịla mmanya anya mgbe ọ na-acha ọbara ọbara, mgbe ọ na-ezipụta ọdịdị ya nʼiko mgbe ọ na-asụgharị nke ọma nʼime iko.
32Nʼikpeazụ, ọ na-ata dịka agwọ na-atụkwa dịka ajụala.