26Nwa m, nye m obi gị ka ụzọ m niile nyekwa anya gị ọṅụ.
27Nʼihi na onye akwụna bụ olulu miri emi, nwanyị nwe di na-akwa iko bụ olulu mmiri dị warawara.
28Dịka onye ohi ka ọ na-echere na-emekwa ka ndị na-ekwesighị ntụkwasị obi baa ụba nʼetiti ụmụ nwoke.
29Onye ka obi ya jupụtara nʼahụhụ? Onye nọ na iru ụjụ? Olee onye nwere esemokwu? Onye nwere ọtụtụ ihe mkpesa? Onye nwere mmerụ ahụ nke na-abaghị uru? Onye nwere anya nke na-acha ọbara ọbara?
30Ọ bụ ndị na-anọ ogologo oge na-aṅụ mmanya, onye na-aga ịchọpụta mmanya agwara agwa.