24Nna onye ezi omume ga-aṅụrị ọṅụ. Ọ bụkwa ihe oke ọṅụ inweta nwa maara ihe.
25Ka nne na nna gị nwee obi ụtọ. Ka onye mụrụ gị ṅụrịa.
26Nwa m, nye m obi gị ka ụzọ m niile nyekwa anya gị ọṅụ.
27Nʼihi na onye akwụna bụ olulu miri emi, nwanyị nwe di na-akwa iko bụ olulu mmiri dị warawara.
28Dịka onye ohi ka ọ na-echere na-emekwa ka ndị na-ekwesighị ntụkwasị obi baa ụba nʼetiti ụmụ nwoke.