5Nʼihi na akụ nwere ike ifu nʼotu ntabi anya dịka a ga-asị na ha nwere nku dịka nnụnụ ugo.
6Erila nri onye aka ntagide na-enye gị. Nri ụtọ ya agụkwala gị agụ.
7Nʼihi na ọ bụ ụdị mmadụ ahụ na-eche ọnụahịa ihe ọ na-emefuru gị. Ọ na-asị gị, “Rie ihe, ṅụọkwa ihe ọṅụṅụ,” ma obi ya adịghị nʼebe ị nọ.
8Ị ga-agbọkwa nke ntakịrị ahụ i riri mgbe ahụ, okwu ọma ahụ niile i kwuru banyere ya ga-abụ ihe efu.
9Atụfula ume gị ịgwa onye nzuzu okwu, nʼihi na ọ ga-eleda okwu i sitere nʼezi uche kwuo anya.