3Achọsila nri ụtọ ya ike, nʼihi na nri ahụ bụ nri aghụghọ.
4Adọgbula onwe gị nʼọrụ maka ịbụ ọgaranya, atụkwasịla obi na nghọta gị.
5Nʼihi na akụ nwere ike ifu nʼotu ntabi anya dịka a ga-asị na ha nwere nku dịka nnụnụ ugo.
6Erila nri onye aka ntagide na-enye gị. Nri ụtọ ya agụkwala gị agụ.
7Nʼihi na ọ bụ ụdị mmadụ ahụ na-eche ọnụahịa ihe ọ na-emefuru gị. Ọ na-asị gị, “Rie ihe, ṅụọkwa ihe ọṅụṅụ,” ma obi ya adịghị nʼebe ị nọ.