1Mgbe gị na onye na-achị achị nọdụrụ irikọ nri, lezie ihe dị nʼihu gị anya,
2tụkwasị mma nʼakpịrị gị, ma ọ bụrụ na ị bụ onye iri oke nri na-atọ ụtọ.
3Achọsila nri ụtọ ya ike, nʼihi na nri ahụ bụ nri aghụghọ.
4Adọgbula onwe gị nʼọrụ maka ịbụ ọgaranya, atụkwasịla obi na nghọta gị.
5Nʼihi na akụ nwere ike ifu nʼotu ntabi anya dịka a ga-asị na ha nwere nku dịka nnụnụ ugo.