Ilu 24

Nwa m nwoke, rachaa mmanụ aṅụ nʼihi na ọ dị mma. Mmanụ aṅụ nke si nʼugbugbo mmanụ aṅụ na-adị gị ụtọ nʼọnụ.

Proverbs 24:13 (UKJV) My son, eat you honey, because it is good; and the honeycomb, which is sweet to your taste:

11Napụta ndị a na-eduba nʼọnwụ. Napụtakwa ndị ahụ a mara ikpe ọnwụ nʼụzọ na-ezighị ezi.

12Ọ bụrụ na ị sị, “Anyị amaghị banyere ihe ndị a,” ọ bụ na onye na-enyocha obi aghọtaghị ya? Ọ bụ na onye na-eche ndụ gị amaghị ya? Ọ bụ na ọ gaghị akwụghachi onye ọbụla ụgwọ dịka akaọrụ ya siri dị?

13Nwa m nwoke, rachaa mmanụ aṅụ nʼihi na ọ dị mma. Mmanụ aṅụ nke si nʼugbugbo mmanụ aṅụ na-adị gị ụtọ nʼọnụ.

14Marakwa na otu a ka amamihe kwesiri isi tọọ obi gị ụtọ. Ọ bụrụ na i chọta ya i nwere olileanya nke ga-adịgide.

15Adịla ka onye na-emebi iwu, onye echiche ya niile bụ imegide ụlọ onye ezi omume. A gakwala ga kwakọrọ ihe dị nʼụlọ ya.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.