12Ọ bụrụ na ị sị, “Anyị amaghị banyere ihe ndị a,” ọ bụ na onye na-enyocha obi aghọtaghị ya? Ọ bụ na onye na-eche ndụ gị amaghị ya? Ọ bụ na ọ gaghị akwụghachi onye ọbụla ụgwọ dịka akaọrụ ya siri dị?
13Nwa m nwoke, rachaa mmanụ aṅụ nʼihi na ọ dị mma. Mmanụ aṅụ nke si nʼugbugbo mmanụ aṅụ na-adị gị ụtọ nʼọnụ.
14Marakwa na otu a ka amamihe kwesiri isi tọọ obi gị ụtọ. Ọ bụrụ na i chọta ya i nwere olileanya nke ga-adịgide.
15Adịla ka onye na-emebi iwu, onye echiche ya niile bụ imegide ụlọ onye ezi omume. A gakwala ga kwakọrọ ihe dị nʼụlọ ya.
16Nʼihi na onye ezi omume nwere ike daa ugboro asaa ma o ga-ebilikwa ọzọ. Ma ndị na-emebi iwu na-asọ ngọngọ mgbe nsogbu bịakwasịrị ha.