Ilu 24

Ndị a bụkwa okwu ọzọ ndị amamihe kwuru, iji gosi na ikpe ikpe na-akwụghị ọtọ adịghị mma.

Proverbs 24:23 (UKJV) These things also belong to the wise. It is not good to have respect of persons in judgment.

21Nwa m, tụọ egwu Onyenwe anyị na onye bụ eze, esonyerela ndị ozi na-enupu isi megide nna ha ukwu.

22Nʼihi na ọ bụ na mberede ka ị ga-eso ha daba na nhụju anya. Onye maara ihe ga-abụ ọgwụgwụ ya?

23Ndị a bụkwa okwu ọzọ ndị amamihe kwuru, iji gosi na ikpe ikpe na-akwụghị ọtọ adịghị mma.

24Onye ọbụla nke na-asị onye ikpe mara, “Onye ezi omume ka ị bụ,” ga-anata ọbụbụ ọnụ site nʼọnụ ọtụtụ mmadụ, mba niile ga-eweso ya iwe.

25Ma ọ ga-adịrị ndị ahụ na-abara onye ikpe mara mba na mma, ha ga-anatakwa ezi ngọzị.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.