19Ekwosola onye na-emebi iwu ekworo, maọbụ nwe anya ukwu nʼebe onye ajọ omume nọọ.
20Nʼihi na onye na-emebi iwu enweghị ọdịnihu; a ga-afụnyụkwa ọkụ onye ajọ omume.
21Nwa m, tụọ egwu Onyenwe anyị na onye bụ eze, esonyerela ndị ozi na-enupu isi megide nna ha ukwu.
22Nʼihi na ọ bụ na mberede ka ị ga-eso ha daba na nhụju anya. Onye maara ihe ga-abụ ọgwụgwụ ya?
23Ndị a bụkwa okwu ọzọ ndị amamihe kwuru, iji gosi na ikpe ikpe na-akwụghị ọtọ adịghị mma.