Ilu 24

Ekwosola onye na-emebi iwu ekworo, maọbụ nwe anya ukwu nʼebe onye ajọ omume nọọ.

Proverbs 24:19 (UKJV) Fret not yourself because of evil men, neither be you envious at the wicked:

17Aṅụrịla ọṅụ mgbe onye iro gị dabara na nsogbu. Ka obi gharakwa ịtọ gị ụtọ mgbe ọ dara.

18Nʼihi na Onyenwe anyị pụrụ iwe iwe nʼihi ya megide gị ma kwụsị ịta ya ahụhụ.

19Ekwosola onye na-emebi iwu ekworo, maọbụ nwe anya ukwu nʼebe onye ajọ omume nọọ.

20Nʼihi na onye na-emebi iwu enweghị ọdịnihu; a ga-afụnyụkwa ọkụ onye ajọ omume.

21Nwa m, tụọ egwu Onyenwe anyị na onye bụ eze, esonyerela ndị ozi na-enupu isi megide nna ha ukwu.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.