7Amamihe dị elu nke ukwuu nye ndị nzuzu, ha gaghị asaghe ọnụ ha nʼọgbakọ ọnụ ụzọ ama.
8Onye na-eche echiche ime ihe ọjọọ ka a ga-agụ dịka onye nzube ihe ọjọọ
9Nzube niile nke onye na-enweghị uche bụ mmehie, ndị mmadụ na-akpọ onye na-akwa emo asị.
10Ọ bụrụ na ị pụghị iguzosi ike nʼoge nsogbu, ị bụ nnọọ onye ike ya dị ntakịrị.
11Napụta ndị a na-eduba nʼọnwụ. Napụtakwa ndị ahụ a mara ikpe ọnwụ nʼụzọ na-ezighị ezi.