13Onyeozi kwesiri ntụkwasị obi na-eweta ntute na ndụ, dịka mmiri oyi si eme ka ahụ dị jụụ nʼoge okpomọkụ owuwe ihe ubi.
14Onye ahụ na-adịghị emezu nkwa o kwere dịka igwe ojii nke na-adịghị ezo mmiri.
15Nwee ndidi, nʼikpeazụ ị ga-enwe mmeri, nʼihi na ire dị nro na-agbaji ọkpụkpụ.
16Mmanụ aṅụ ọ na-atọ gị ụtọ? Arachala ya karịa, ka ọ ghara iwetara gị ọrịa.
17Ejela ileta onye agbataobi gị mgbe mgbe, ka ị ghara ire ugwu gị.