Ilu 25

Mgbe ị na-eme nke a, ị na-agụkwasị icheku ọkụ na-ere ere nʼisi ya, Onyenwe anyị ga-akwụghachikwa gị.

Proverbs 25:22 (UKJV) For you shall heap coals of fire upon his head, and the LORD shall reward you.

20Dịka onye e yipụrụ uwe nʼụbọchị oyi ụgụrụ, maọbụ iwere nnu tee nʼelu ọnya, otu a ka onye na-abụrụ onye iwe na-ewe abụ dị.

21Ọ bụrụ na agụụ na-agụ onye iro gị, nye ya nri ka o rie, ọ bụrụkwa na akpịrị na-akpọ ya nkụ, nye ya mmiri ka ọ ṅụọ.

22Mgbe ị na-eme nke a, ị na-agụkwasị icheku ọkụ na-ere ere nʼisi ya, Onyenwe anyị ga-akwụghachikwa gị.

23Dịka ifufe si nʼugwu si eweta mmiri ozuzo, otu a ka ikwu mmadụ okwu azụ si eweta iwe.

24Ọ ka mma ibi nʼotu akụkụ elu ụlọ karịa ibinyere nwanyị na-ese okwu.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.