22Mgbe ị na-eme nke a, ị na-agụkwasị icheku ọkụ na-ere ere nʼisi ya, Onyenwe anyị ga-akwụghachikwa gị.
23Dịka ifufe si nʼugwu si eweta mmiri ozuzo, otu a ka ikwu mmadụ okwu azụ si eweta iwe.
24Ọ ka mma ibi nʼotu akụkụ elu ụlọ karịa ibinyere nwanyị na-ese okwu.
25Oziọma e sitere na mba dị anya nata dị ka mmiri jụrụ oyi nye onye akpịrị na-akpọ nkụ.
26Onye ezi omume nke kwenyere nʼihe onye na-emebi iwu kwuru dị ka iyi a gwọrụrụ nʼisi ya.