25Oziọma e sitere na mba dị anya nata dị ka mmiri jụrụ oyi nye onye akpịrị na-akpọ nkụ.
26Onye ezi omume nke kwenyere nʼihe onye na-emebi iwu kwuru dị ka iyi a gwọrụrụ nʼisi ya.
27Dịka ịracha mmanụ aṅụ hie nne si jọọ njọ, otu a ka o si bụrụ ihe na-enweghị nsọpụrụ, mmadụ ịchọpụta ihe ndị ezomiri ezomi.
28Nwoke ọbụla na-adịghị achị mmụọ ya dị ka obodo na-enweghị ndị na-eche ya nche, nke e tikpọrọ mgbidi ya etikpọ.