Ilu 25

Wepụ ihe ahụ niile na-ekpuchi mma ọlaọcha, onye ọkpụ ụzụ ọla ga-arụpụta efere;

Proverbs 25:4 (UKJV) Take away the dross from the silver, and there shall come forth a vessel for the finer.

2Ọ bụ nsọpụrụ Chineke izobe okwu, ma nsọpụrụ ndị eze bụ ịchọpụta ala okwu.

3Dịka ịdị elu nke eluigwe, dịka ịdị omimi nke ala, otu a ka obi ndị eze bụ ihe a na-apụghị ịchọpụta.

4Wepụ ihe ahụ niile na-ekpuchi mma ọlaọcha, onye ọkpụ ụzụ ọla ga-arụpụta efere;

5wezugakwa ndịisi nʼeme ajọ ihe nʼihu eze, ocheeze ya ga-eguzosikwa ike site nʼezi omume.

6Egosipụtala onwe gị nʼihu eze, ewerela ọnọdụ nʼetiti ndị oke mmadụ,

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.