4Wepụ ihe ahụ niile na-ekpuchi mma ọlaọcha, onye ọkpụ ụzụ ọla ga-arụpụta efere;
5wezugakwa ndịisi nʼeme ajọ ihe nʼihu eze, ocheeze ya ga-eguzosikwa ike site nʼezi omume.
6Egosipụtala onwe gị nʼihu eze, ewerela ọnọdụ nʼetiti ndị oke mmadụ,
7ọ ga-aka mma ma ọ bụrụ na ọ si gị, “Rigota nʼebe a,” karịa na o wedara gị ala nʼihu ndị oke mmadụ. Ihe iji anya gị abụọ hụ
8e mekwala ngwangwa ịga nʼụlọikpe, nʼihi na ọ bụ gịnị ka ị ga-eme nʼikpeazụ ma ọ bụrụ nʼonye agbataobi gị etinye gị nʼọnọdụ ihere?