11Dịka nkịta laghachiri ọzọ nʼihe ọ gbọrọ, otu a ka ndị nzuzu dị mgbe ha na-emekwa omume enweghị uche ha.
12Ị hụrụ onye mara ihe nʼanya nke onwe ya? Olileanya dị nye onye nzuzu karịa ndị dị otu a.
13Onye umengwụ na-asị, “Ọdụm nọ nʼokporoụzọ, ọdụm ji oke iwe na-awagharị nọ nʼama niile!”
14Dịka ibo ọnụ ụzọ si emegharị nʼihe nkonye ya, otu a ka onye umengwụ si na-atụgharị onwe ya nʼelu ihe ndina ya.
15Onye umengwụ na-amanye aka nʼefere nri ma oke umengwụ a naghị ekwe ka o weghachi ya tinye nʼọnụ ya.