21Dịka icheku si eme ka nkụ nwuru ọkụ, otu a ka onye na-ese okwu si eme ka ọgụ nwuru ọkụ.
22Okwu niile nke onye na-agba asịrị na-ekwu dịka iberibe nri nʼatọ ezi ụtọ, ha na-agbadakwa nʼime ime ala afọ.
23Dịka ite aja ụrọ nke e ji ọlaọcha na-abaghị uru techie, ka egbugbere ọnụ dị nro nke obi jupụtara nʼihe ọjọọ bụ.
24Ndị iro na-eji egbugbere ọnụ ha gbanwee onwe ha, ma nʼime obi ha ọ bụ naanị aghụghọ dị ya.
25Okwu ọnụ ya nwere ike tọọ ụtọ na ntị ma ekwenyerela ha, nʼihi na ihe arụ asaa jupụtara nʼime obi ha.