19ka nwoke ahụ bụ nke na-aghọgbu onye agbataobi ya ma sị, “ọ bụ naanị egwuregwu ka m na-egwu.”
20Ọkụ na-anyụ mgbe nkụ gwụrụ, otu a kwa esemokwu na-akwụsị mgbe a kwụsịrị ikwu ndị ọzọ okwu nʼazụ.
21Dịka icheku si eme ka nkụ nwuru ọkụ, otu a ka onye na-ese okwu si eme ka ọgụ nwuru ọkụ.
22Okwu niile nke onye na-agba asịrị na-ekwu dịka iberibe nri nʼatọ ezi ụtọ, ha na-agbadakwa nʼime ime ala afọ.
23Dịka ite aja ụrọ nke e ji ọlaọcha na-abaghị uru techie, ka egbugbere ọnụ dị nro nke obi jupụtara nʼihe ọjọọ bụ.