25Okwu ọnụ ya nwere ike tọọ ụtọ na ntị ma ekwenyerela ha, nʼihi na ihe arụ asaa jupụtara nʼime obi ha.
26Ọ bụ ezie na ọ ga na-eme ka ọ hụrụ gị nʼanya, ma iro ya ga-apụta ihe, mmadụ niile ga-ahụkwa ya.
27Onye na-egwuru ibe ya olulu ga-adaba nʼime ya. Ọzọ, onye na-enuda nkume, ya ka nkume ahụ ga-adagbu.
28Onye ị kpọrọ asị bụ onye ị ga-achọ iwetara ihe mgbu site nʼịgha ụgha. Okwu ọma na-esighị nʼobi mmadụ pụta na-eweta ịla nʼiyi.