Ilu 27

Ọ bụrụ na onye ọbụla e jiri oke olu gọzie onye agbataobi ya nʼisi ụtụtụ a ga-agụ nke a dịka ịbụ ọnụ.

Proverbs 27:14 (UKJV) He that blesses his friend with a loud voice, rising early in the morning, it shall be counted a curse to him.

12Onye nwere uche na-ahụ nsogbu nke na-abịa nʼihu ma zobe onwe ya. Ma onye na-enweghị uche anaghị ele anya, ọ na-adaba nʼime nsogbu ahụ taa ahụhụ so ya.

13Chịrị uwe onye ahụ nke naara onye mba ọzọ na mbe. E, chiri ya ma ọ bụrụ nwanyị na-abụghị nwunye ya ka o nara na mbe.

14Ọ bụrụ na onye ọbụla e jiri oke olu gọzie onye agbataobi ya nʼisi ụtụtụ a ga-agụ nke a dịka ịbụ ọnụ.

15Mmiri na-ata nʼime ụlọ mgbe mmiri na-ezo na nwanyị na-eso okwu bụ otu.

16Onye nwere ike ịkwụsị ya nwere ike iji aka jide ifufe, maọbụ were aka jide mmanụ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.