14Ọ bụrụ na onye ọbụla e jiri oke olu gọzie onye agbataobi ya nʼisi ụtụtụ a ga-agụ nke a dịka ịbụ ọnụ.
15Mmiri na-ata nʼime ụlọ mgbe mmiri na-ezo na nwanyị na-eso okwu bụ otu.
16Onye nwere ike ịkwụsị ya nwere ike iji aka jide ifufe, maọbụ were aka jide mmanụ.
17Dịka e si eji igwe amụ igwe ọzọ ka ọ dị nkọ, otu a ka mmadụ si enyere ibe ya aka ịdị nkọ.
18Onye na-eche osisi fiig nche ga-eri mkpụrụ ya, onye na-echebekwa nna ya ukwu ka a ga-asọpụrụ.