15Mmiri na-ata nʼime ụlọ mgbe mmiri na-ezo na nwanyị na-eso okwu bụ otu.
16Onye nwere ike ịkwụsị ya nwere ike iji aka jide ifufe, maọbụ were aka jide mmanụ.
17Dịka e si eji igwe amụ igwe ọzọ ka ọ dị nkọ, otu a ka mmadụ si enyere ibe ya aka ịdị nkọ.
18Onye na-eche osisi fiig nche ga-eri mkpụrụ ya, onye na-echebekwa nna ya ukwu ka a ga-asọpụrụ.
19Dịka e si ahụ ihu mmadụ nʼime mmiri otu a ka obi mmadụ si egosi ihe onye ahụ bụ.