5Mba abara nʼihe ka mma karịa ịhụnanya ezoro ezo.
6Ihe kwesiri ntụkwasị obi ka mmerụ ahụ nke sitere nʼaka enyi bụ, ma onye iro na-eme ka isutu ọnụ mụbaa.
7Mmanụ aṅụ adịghị atọ onye rijuru afọ ụtọ; ma mgbe agụụ ji ya, ọ ga-eri ọ bụladị ihe dị ilu.
8Nwoke na-akpafu site nʼụlọ ya dị ka nnụnụ na-amakwaghị akwụ ya.
9Mmanụ isi ụtọ na ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ na-eme ka obi ṅụrịa, otu a ka ụtọ enyi dị, site na ndụmọdụ nke mkpụrụobi ha.