Ilu 27

Mmanụ isi ụtọ na ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ na-eme ka obi ṅụrịa, otu a ka ụtọ enyi dị, site na ndụmọdụ nke mkpụrụobi ha.

Proverbs 27:9 (UKJV) Ointment and perfume rejoice the heart: so does the sweetness of a man's friend by hearty counsel.

7Mmanụ aṅụ adịghị atọ onye rijuru afọ ụtọ; ma mgbe agụụ ji ya, ọ ga-eri ọ bụladị ihe dị ilu.

8Nwoke na-akpafu site nʼụlọ ya dị ka nnụnụ na-amakwaghị akwụ ya.

9Mmanụ isi ụtọ na ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ na-eme ka obi ṅụrịa, otu a ka ụtọ enyi dị, site na ndụmọdụ nke mkpụrụobi ha.

10Ahapụla enyi gị maọbụ ndị enyi nna gị. Mgbe ị nọ na mkpa arịọla nwanne gị ka o nyere gị aka. Onye agbataobi nọ gị nso nwere ike inyere gị aka karịa nwanne gị nọ ebe dị anya.

11Nwa m, obi ga-atọ m ụtọ nke ukwuu ma a sị na ị ga-amụta ihe! Mgbe ahụ, aga m enwe ihe m ga-asa ndị na-akọcha m.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.