1Ndị ajọ omume na-agba ọsọ mgbe onye ọbụla na-adịghị achụ ha, ma ndị ezi omume na-enwe ntụkwasị obi dịka ọdụm.
2Mgbe njehie dị nʼobodo dị ọtụtụ, o nwere ọtụtụ ndịisi, ma onyeisi nwere ezi nghọta na ihe ọmụma ga-eme ka udo na-adịgide ogologo oge.
3Onye na-achị achị nke na-emegbu ndị ogbenye, bụ mmiri ozuzo nke na-azachapụ ihe niile mee ka nri ghara ịdị.
4Onye na-adịghị asọpụrụ iwu na-eto ndị ajọ omume, ma ndị na-edebe ihe iwu kwuru na-ebu agha megide ha.