Ilu 28

Ndị ajọ omume adịghị aghọta uru ikpe ziri ezi bara, ma ndị na-eso Onyenwe anyị na-aghọta ihe bụ uru ya.

Proverbs 28:5 (UKJV) Evil men understand not judgment: but they that seek the LORD understand all things.

3Onye na-achị achị nke na-emegbu ndị ogbenye, bụ mmiri ozuzo nke na-azachapụ ihe niile mee ka nri ghara ịdị.

4Onye na-adịghị asọpụrụ iwu na-eto ndị ajọ omume, ma ndị na-edebe ihe iwu kwuru na-ebu agha megide ha.

5Ndị ajọ omume adịghị aghọta uru ikpe ziri ezi bara, ma ndị na-eso Onyenwe anyị na-aghọta ihe bụ uru ya.

6Ọ kaara gị mma ịbụ nwa ogbenye na onye eziokwu karịa na ị bụ ọgaranya na eze aghụghọ.

7Ụmụ okorobịa nwere nghọta na-eme ihe iwu kwuru, ma nwa nke ya na ndị oke oriri bụ enyi na-emenye nna ya ihere.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.