16Mgbe ndị na-emebi iwu na-aga nʼihu, njehie na-aba ụba nʼetiti ndị a na-achị achị, ma ndị ezi omume ga-eguzo hụ ọdịda ha.
17Dọọ nwa gị aka na ntị, ndụ ya ga-enye obi gị udo na ọṅụ. Ọ gaghị emekwa ka ihere mee gị.
18Obodo na-adịghị atụ egwu Chineke bụ obodo na-adịghị agazi nʼusoro, ma ọṅụ na-adịrị obodo ahụ na-edebe ihe Onyenwe anyị nyere nʼiwu.
19Ọ bụghị naanị okwu ọnụ ka e ji adọ ndị na-eje ozi aka na ntị, nʼihi na ha nwere ike ghọta ma ha ga-ajụ ime ihe ị chọrọ.
20Olileanya dịrị onye nzuzu karịa onye ahụ na-adịghị echezi echiche tupu o kwuo okwu.