24Ndị ọbụla na-enyere ndị ohi aka bụ ndị iro nke ndụ ha, a na-edu ha nʼịṅụ iyi, ma ha adịghị agba akaebe.
25Ịtụ egwu mmadụ bụ ihe ịma nʼọnya, ma onye ọbụla na-atụkwasị Onyenwe anyị obi na-anọ nʼudo.
26Ị chọrọ ikpe ziri ezi? Elela onye ikpe anya nʼihu, kama gwa Onyenwe anyị maka ya.
27Onye ezi omume na-akpọ ajọ omume asị; ndị na-emebi iwu na-akpọ onye ndụ ya ziri ezi asị.