1Onye a na-abara mba mgbe niile ma ọ naghị anata ndụmọdụ, nʼotu ntabi anya ka a ga-etipịa ya, ọ gaghị ekulikwa ọzọ.
2Mgbe ndị ezi omume nọ nʼọchịchị, ndị a na-achị na-aṅụrị ọṅụ, ma ha na-asụ ude mgbe onye ajọ omume na-achị.
3Nwoke hụrụ amamihe nʼanya na-eme ka nna ṅụrịa, ma onye bụ enyi ụmụ nwanyị akwụna, na-ala akụnụba ya nʼiyi.
4Eze na-achị nʼeziokwu na-ewetara obodo ya ọganihu, ma nke na-achọ ngarị na-ala ya nʼiyi.
5Onye ahụ ji ire ụtọ na-aja onye agbataobi ya mma bụ ọnya ka ọ na-esiri ya.