11Nwa m nwoke ajụla ịdọ aka na ntị nke Onyenwe anyị, ike agwụla gị ịnagide ịba mba ya.
12Nʼihi na ọ bụ ndị Onyenwe anyị hụrụ nʼanya ka ọ na-abara mba, dịka nna si abara nwa ya nke ihe ya na-atọ ya ụtọ mba.
13Onye a gọziri agọzi ka mmadụ ahụ bụ onye chọtara amamihe, onye nwetara nghọta.
14Nʼihi na amamihe dị mma karịa ọlaọcha, ọ bakwara uru karịa ọlaedo.
15Ọ dị oke ọnụahịa karịa ọla rubi, ọ dịghị ihe na-amasị gị e ji atụnyere ya.