13Onye a gọziri agọzi ka mmadụ ahụ bụ onye chọtara amamihe, onye nwetara nghọta.
14Nʼihi na amamihe dị mma karịa ọlaọcha, ọ bakwara uru karịa ọlaedo.
15Ọ dị oke ọnụahịa karịa ọla rubi, ọ dịghị ihe na-amasị gị e ji atụnyere ya.
16Ndụ ogologo dị nʼaka nri ya; nʼaka ekpe ya ka akụnụba na nsọpụrụ dịkwa.
17Ụzọ ya bụ ụzọ dị mma bụrụkwa ụzọ udo.