Ilu 3

Ụzọ ya bụ ụzọ dị mma bụrụkwa ụzọ udo.

Proverbs 3:17 (UKJV) Her ways are ways of pleasantness, and all her paths are peace.

15Ọ dị oke ọnụahịa karịa ọla rubi, ọ dịghị ihe na-amasị gị e ji atụnyere ya.

16Ndụ ogologo dị nʼaka nri ya; nʼaka ekpe ya ka akụnụba na nsọpụrụ dịkwa.

17Ụzọ ya bụ ụzọ dị mma bụrụkwa ụzọ udo.

18Amamihe bụ osisi nke ndụ nye ndị na-ejide ya aka, e, onye ahụ nke na-ejidesi ya aka ike ka ihe na-agara nke ọma.

19Ọ bụ site nʼamamihe ka Onyenwe anyị ji tọọ ntọala ụwa; ọ bụkwa nghọta ya mere ka eluigwe dịrị ebe ọ dị.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.