32Nʼihi na ndị dị otu a bụ ihe arụ nʼanya Onyenwe anyị, ma ọ na-emeso ndị na-eme ihe ziri ezi mmeso ọma.
33Ọbụbụ ọnụ Onyenwe anyị dị nʼụlọ ndị na-eme ajọ omume, ma ọ na-agọzi ụlọ ndị ezi omume.
34Ndị mpako na-akwa emo ka ya onwe ya na-akwakwa emo, ma ndị dị umeala nʼobi ka ọ na-enye amara.
35Ndị maara ihe na-enweta nsọpụrụ, ma ndị nzuzu na-enweta ihere.