17“Onye ahụ na-akwa nna ya emo, nke na-akpọkwa irubere nne ya isi asị, ugolọma ga-atụrụ mkpụrụ anya ya, udele ga-erikwa anụ ahụ ya.
18“Ọ dị ihe atọ na-agbagwoju m anya, apụghị m ịghọta ha; mbaa, ha dị anọ!
19Otu ugo si efegharị na mbara eluigwe; otu agwọ si akpụ nʼelu nkume, otu ụgbọ mmiri si achọta ụzọ ya nʼoke osimiri; na otu ịhụnanya si eto nʼetiti nwoke na nwaagbọghọ.
20“Nke bụ ụzọ nwanyị na-akwa iko, Ọ na-eri ma hichaa ọnụ ya, na-asị, ‘E meghị m ajọ ihe ọbụla.’
21“Ọ dị ihe atọ na-eme ka ụwa maa jijiji, nʼokpuru ihe anọ nke ọ na-apụghị ịnagide,