25Ndanda bụ ndị na-enweghị ume, ma ha na-akpakọta nri ha, dozie nke ha ga-eri nʼoge oyi.
26Ewi nkume bụ ndị na-adịghị ike, ma ha na-echebe onwe ha site nʼibi nʼọgba nkume.
27Igurube enweghị eze, ma ha na-aga nʼigwe nʼahịrị nʼahịrị.
28Ngwere dị mfe iji aka jide ya, ma ị ga-achọta ha ọ bụladị nʼụlọ ndị eze.
29“Ha dị ihe atọ na-ejegharị nʼụwa nʼọnọdụ ịdị oke ebube, mbaa, ha dị anọ: