27Igurube enweghị eze, ma ha na-aga nʼigwe nʼahịrị nʼahịrị.
28Ngwere dị mfe iji aka jide ya, ma ị ga-achọta ha ọ bụladị nʼụlọ ndị eze.
29“Ha dị ihe atọ na-ejegharị nʼụwa nʼọnọdụ ịdị oke ebube, mbaa, ha dị anọ:
30Ọdụm, eze ụmụ anụmanụ. Ọ naghị atụ onye ọbụla egwu,
31na oke ọkụkọ na-ejegharị ejegharị, na mkpi, na eze ndị agha ya gbara gburugburu.