5“Okwu ọnụ Chineke niile bụ ihe anụchara anụcha, Ọ bụ ọta nye ndị na-agbaba nʼime ya izere ndụ.
6Atụkwasịla ihe ọbụla nʼokwu ya, ka ọ ghara ịbara gị mba, ka ị gharakwa ịghọ onye ụgha.
7“O Onyenwe anyị, naanị ihe abụọ ka m na-arịọ gị tupu m nwụọ; ajụkwala imere m ha:
8Nke mbụ, mee ka okwu efu na okwu ụgha dị anya nʼebe m nọ. Nke abụọ, e nyela m ọnọdụ ogbenye maọbụ ọnọdụ ọgaranya, kama nye m naanị nri ga-ezuru m kwa ụbọchị niile.
9Nʼihi na, ọ bụrụ na m aghọọ ọgaranya, ma eleghị anya, afọ ga-eju m, jubiga m oke, ruo na m ga-asị na m achọkwaghị gị ma kwuokwa si, ‘Onye ka Onyenwe anyị bụ?’ Ọ bụrụkwa na m adaa ogbenye, ma eleghị anya, aga m ezu ohi, site nʼụzọ dị otu a, wetara aha nsọ gị Chineke, ihe ihere.