24Ọ na-akpa ma na-adụkwa akwa dị iche iche, ya na ihe ike nʼukwu, ndị ọ na-eresi ndị ahịa ndị ọzọ.
25Ọ bụ nwanyị dị ike, onye a na-asọpụrụ asọpụrụ. Ụjọ adịghị atụkwa ya maka ihe ga-eme nʼoge dị nʼihu.
26Ọ na-eji amamihe na-ekwu okwu ntụziaka kwesiri dịkwa nʼire ya.
27Ọ na-etinye uche nʼihe niile banyere ezinaụlọ ya, ọ naghị arụ ọrụ umengwụ.
28Ụmụ ya na-ebili gọzie ya; otu a kwa di ya ga-eto ya ezi otuto.