18Ma ụzọ ndị ezi omume dị ka anyanwụ na-awa nʼisi ụtụtụ, nke na-enwuwakwa dịka ìhè nʼetiti ehihie ụbọchị.
19Ma ụzọ onye na-emebi iwu dị ka itiri nke ọchịchịrị, ha anaghị ama ihe na-eme ka ha sụọ ngọngọ.
20Gee ntị nwa m, nʼihe m na-ekwu. Gee ntị nke ọma.
21Doo ihe ndị a nʼuche gị mgbe niile; ka ha bamiekwa nʼime obi gị,
22nʼihi na ha bụ ndụ nye ndị chọtara ha, bụrụkwa ahụ ike nye mmadụ.