Ilu 6

Ekwekwala ka ụra baa gị anya abụọ, ekwekwala ka mbụbara anya gị ruo ụra.

Proverbs 6:4 (UKJV) Give not sleep to yours eyes, nor slumber to yours eyelids.

2ị bụrụla onye mara nʼọnya site nʼihe ị kwuru, onye enwudere site nʼokwu ọnụ ya.

3Mee nke a, nwa m, si nʼime ya wepụ onwe gị; nʼihi na ịdabala nʼaka onye agbataobi gị: Jee ọsịịsọ weda onwe gị nʼala rịọọ ya enyekwala ya izuike ọbụla.

4Ekwekwala ka ụra baa gị anya abụọ, ekwekwala ka mbụbara anya gị ruo ụra.

5Napụta onwe gị, dịka mgbada site nʼaka dinta, maọbụ dịka nnụnụ site nʼọnya osi ọnya.

6Gaa mụta ihe site nʼaka ndanda, gị onye umengwụ. Mụta ihe site nʼụzọ ya niile.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.