9nʼoge anyasị, dịka chi na-eji, mgbe ọchịchịrị na-agbachi.
10Mgbe ahụ, nwanyị ahụ pụtara zute ya. O yi uwe dịka nwanyị akwụna, jiri aghụghọ na-abịakwute ya.
11(Ọ na-eme ụzụ na-aṅaghị ntị ịnụ ihe ọbụla. Ụkwụ ya anaghị anọgide nʼụlọ ya.
12Ọ na-akwụgharị ma nʼokporoụzọ ma nʼama; na-amịgharị nʼebe nzuzo niile.)
13O weere aka ya abụọ jikụọ nwokorobịa ahụ nʼolu, sutu ya ọnụ, were ihu nke ihere na-adịghị, sị: