11(Ọ na-eme ụzụ na-aṅaghị ntị ịnụ ihe ọbụla. Ụkwụ ya anaghị anọgide nʼụlọ ya.
12Ọ na-akwụgharị ma nʼokporoụzọ ma nʼama; na-amịgharị nʼebe nzuzo niile.)
13O weere aka ya abụọ jikụọ nwokorobịa ahụ nʼolu, sutu ya ọnụ, were ihu nke ihere na-adịghị, sị:
14“Emezuru m nkwa niile m kwere taa, enwekwara m nri nke sitere nʼihe aja udo m chụrụ nʼụlọ m,
15Ọ bụ gị ka m na-achọkwute, lee gị ka ị na-abịa.