2Debe iwu m ka ị dị ndụ, chee ozizi m nche dịka ọ bụ mkpụrụ anya gị.
3Kee ha na mkpịsịaka gị, deekwa ha nʼelu mbadamba nkume, bụ obi gị.
4Hụ amamihe nʼanya dịka nwaagbọghọ ị hụrụ nʼanya; hụkwa inwe nghọta nʼanya dịka a ga-asị na ọ bụ nwanne gị.
5Kwee ka ha debe gị, ka ị ghara ijekwuru nwanyị na-akwa iko, ka ị gharakwa ịṅa ntị nʼokwu ire ụtọ ya.
6Nʼihi na otu ụbọchị, esi m na oghereikuku dị nʼụlọ m lepụ anya,