8Ndụmọdụ m zuruoke, ọ dịkwa mma. Ihe ọjọọ ọbụla adịghị nʼime ya.
9Nʼebe onye nwetara nghọta nọ, okwu m doro anya; nʼebe ndị chọtara ihe ọmụma nọ, okwu m ziri ezi.
10Họrọ ịdọ aka na ntị m karịa ọlaọcha họrọkwa ihe ọmụma karịa ọlaedo dị ezi mma.”
11Amamihe dị mkpa karịa nkume rubi dị oke ọnụahịa. Ọ dịkwaghị ihe a ga-eji tụnyere ya.
12“Mụ onwe m bụ amamihe na ezi nghọta na-agakọta. Enwere m ọmụma ihe na ezi izuzu.