Ilu 8

Site na m ka ndị eze ji achị, ọ bụ m na-eme ka ndị na-achị achị mee iwu ziri ezi.

Proverbs 8:15 (UKJV) By me kings reign, and princes decree justice.

13Ịtụ egwu Onyenwe anyị bụ ịkpọ ihe ọjọọ asị. Akpọrọ m nganga na mpako, omume ọjọọ nakwa okwu gbagọrọ agbagọ asị.

14Ndụmọdụ na ezi nghọta bụ nke m; enwekwara m ọmụma ihe na ike.

15Site na m ka ndị eze ji achị, ọ bụ m na-eme ka ndị na-achị achị mee iwu ziri ezi.

16Site na m ka ndị eze ji achị bụ ndịisi niile na-achị nʼụwa.

17Ndị niile hụrụ m nʼanya ka m na-ahụ nʼanya. Ndị niile na-achọ m aghakwaghị ịchọta m.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.