2Ọ na-eguzo nʼelu ebe niile dị elu nʼokporoụzọ, nʼagbata ụzọ niile.
3Nʼọnụ ụzọ nke obodo niile na nʼọnụ ụzọ ụlọ niile ka ọ nọ na-eti mkpu,
4ọ na-asị, “Ụmụ mmadụ geenụ m ntị; ọ bụ unu ndị dị ndụ ka m na-agwa okwu.
5Unu ndị na-enweghị uche, nweenụ uche zuruoke; unu ndị nzuzu, nweenụ nghọta.
6Geenụ m ntị, nʼihi na enwere m okwu dị mkpa m ga-agwa unu; Ihe ọbụla m kwuru bụ ihe ziri ezi,